Ogbunigwe atụrụ ụnyaahụ bụ Monday n’akụkụ ogige ndị agha ala anyị nke Mogadishu Military Cantonment dina Abuja ataala isi otu onye.

Written by on May 27, 2025

Ihe mgbawa nke ogbunigwe atụrụ n’ebe didobere ogige ndị agha nke Mogadishu Military Cantonment Abuja ụnyaahụ Monday atala isi otu onye ọ bụ ya tụrụ ya.

Onye ọzọ ka e kwukwara na o nwetara ihe mmerụ ahụ site n’ihe mgbawa ahụ akpọrọ improvised explosive device.

Anya hụrụ ka ihe siri mee bụ onye ọrụ agha na achọghị ka akpọọ aha ya gwara ndị nta akụkọ na ọ bụ onye otu ekwe ọnwụ akpọrọ suicide bomber ahụ nwụnyuru anya pii ozugbo ya bụ ihe gbawara.

Ka ọ siladi, ndị ndu nke ndị agha ala ekwuola na ya bụ ihe nwere ike ịbụ ihe sitere na akọrọ ngwa phone battery na ọ gaghị abụ ogbunigwe.

N’oge ndekọ nke akụkọ ụwa anyị ka ndị agha, otu ọrụ nche oje na mmụọ bụ Department of State Services, DSS, ndị uwe ojii tinyere ogbo ha nke ọrụ gbata gbata bụ National emergency management agency nema kana agbakiri ala ịmata kpọmkwem ihe ahụ ọ bụ ya gbawara.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited