Ọgụ kpụ ọkụ n’ọnụ atasuola na mba Sudan kworo maka etu ndị mmadụ si ebubata ngwa ọgụ na mba ahụ aghara aghara.
Written by Onyinye on June 19, 2025
Agha ahụ na-ada na mba Sudan agala n’ihu na akawanye njọ kwa ụbọchị bụ nke e kwuru n’ihe kpatara ya bụ etu ndị mmadụ si were na ebubata ngwa agha dị iche iche na mba ahụ n’ụzọ mkpuke nke kpatara na ọ kaga ete aka tupu ya bụ agha akwụsị.
Ndị ọkachamara mere nyochaa na mba ahụ dị na mgbago ugwu ala ndị isi ojii bụ ụlọrụ akpọrọ Independent international fact finding mission mere ka amata n’ihe na ewuzi na mba Sudan bụ iji oke ngwa ọgụ ndị gbagotere na akusu ndị mmadụ na mpaghara kacha were nwee ọnụ ọgụgụ yana oke ịrị mmadụ elu n’ike.
N’otu nkusu nke otu ahụ na ama gọọmenti aka n’ihu bụ otu Rapid Support Forces mere n’agbata abalị ruo abalị iri na atọ nke ọnwa April n’afọ ka e gburu opekatampe mmadụ karịrị otu narị bụcha ndị nkịtị ebe nke ogbo ha bụ ụsụụ ndị agha mba Sudan akpọrọ Sudanese Armed Forces mere tara isi mmadụ iri na ise na mpaghara AI Koma.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.