Onye isi ala anyi achitola onye ji okwa TRCN na ala anyi.

Written by on May 22, 2025

Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu achitola Prof. Segun Ajiboye ji okwa dika onye isi oche ulo olu ndabenye aha ndi nkuzi ala anyi bu Teachers Registration Council of Nigeria (TRCN).

Prof. Ajiboye ka akowara na akpolitere na yabu okwa nke ugboro abuo ya site na aka onye isi ala nke pugoro apu bu Muhammadu Buhari na abali iri abuo na otu nke onwa September, afo 2021, mana onye isi ala nke noo ugbua chituziri ya na yabu okwa ma nyezi ya odoziaku Ronke Soyombo bu onye ji okwa dika onye ndumodu puru iche nyere aka na achi Ogun state bu prince Dapo Abiodun na ihe gbasara agumakwukwo ihe omimi science nakwa nkanuzu.

Odoziaku Soyombo bu onye rugoro oru mgboro ato dika onye isi oche ulo olu na ahu maka agumakwukwo na Lagos State ka nyere yabu akwukwo mkpolite na okwa oru site na aka minister of education bu Dr. Tunji Alausa na abali iri na ise nke onwa May afo 2025.

Iga echetazi na ulo olu (TRCN) bu ulo olu government etiti guzobere makwa ihu na o bu ihe aturu na ahia ka ana egote na ebe ometutere nkuzi ihe na ala anyi a.

Kaosiladi, ulo akwukwo akuko, Tribune newspaper mekwara ka amata na yabu nwamadi akpolitere na okwa oru ohuru ga ebido oru ozugbo na atufughi oge obuna.

Soyombo ka akowakwara na oji okwa dika onye ndumodu puru iche nyere aka na achi Ogun state bu Prince Dapo Abiodun

Bukwanu okwa nke o kpolitere ya na afo 2019.

Na ikpazu ka emere ka amata na oga aru oru afo ise zuru oke dika onye isi ulo olu TRCN na ala anyi a.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited