Onye isi ndi agha ala anyi na okwa Chief of Army Staff (COAS) agala biri na Makurdi bu isi obodo Benue state.
Written by Onyinye on June 4, 2025
Onye isi ndi agha ala anyi na okwa Chief of Army Staff (COAS) bu Lieutenant General Olufemi Oluyede agala biri na Makurdi bu isi obodo Benue state kwere maka otu ndi ochi ehi tinyere ndi otu agha isi ekwe onwu militants si akwafusi obara ndi mmadu na yabu mpaghara.
Yabu bu ekwafusi obara ndi mmadu nke okowara na ona emezi kwa ubochi, atala isi otutu ndi mmadu, meruo nde kwuru nde aru, ma mebisicha ulo ndi mmadu nke mere na otutu enweghizi ulo obibi.
Ndi nta akuko nwetekwara ozi na Lieutenant General Oluyede hapuru ebe obibi ya na Abuja unya bu Tuesday yana ndi principal staff officers ya tinyekwara ndi isi gbagoterenu na army headquarters iga mee nyocha na yabu mpaghara imata ihe butere yabu ojo onodu enweghi ezi nchekwa.
Akowakwara na yabu onye COAS nyela iwu ka ebute ndi agha soldier ala anyi na yabu mpaghara ka ha wee buo agha megide yabu onodu enweghi ezi nchekwa ahu na eko achicha na yabu Obodo.
Kosiladi emekwara ka amata na lieutenant General Oluyede yana ndi agha soldier ndi ozo onu na eru na okwu na ala anyi ga enwe ogbako iji wee tuputa atumatu kama aga eji soo yabu ajo onodu enweghi ezi nchekwa.
Iga echetazi na yabu ogbaghara di na Benue state ka otutu ndi mmadu kowagoro dika ogu ana alu ikpochapu agburu, ka ahutachara ndi ahu ana enyo enyo na ha bu ndi ochi ehi ebe ha na akwafusi obara ndi mmadu na obodo nke ha.