Onyeisi ala mba Kenya enyela iwu ka ndị uwe ojii gbajie ụkwụ onye ọbụla na awakpo akọrọ ngwa ọhaneze n’aha ngagharị iwe.

Written by on July 10, 2025

President William Ruto na-achị mba Kenya enyela iwu aka ọkụ ụnyaahụ bụ Wednesday ka ndị uwe ojii na mba ahụ jiri egbe ha n’agbaji ụkwụ onye ọbụla na awakpo akọrọ ngwa ọhaneze ma ọ bụ ụlọrụ mmadụ n’aha na ya na-eme ngagharị iwe.

Ntụziaka na-abịa dịka ọnọdụ ihe siri kwụrụ na mba ahụ bụ nke bịara were kawanye njọ. Imirikiti ndị mmadụ ka ahụrụ ka ha malitere ime ngagharị iwe n’isi obodo mba Kenya bụ Nairobi yana ọtụtụ mpaghara ndị ọzọ emegide ọchịchị mba ahụ.

Opekatampe mmadụ iri atọ n’otu ka agbagburu n’ụbọchị Monde nke izu a dịka ụfọdụ akwụkwọ akụkọ na mba ahụ sịrị kọwaa.

Ndị uwe ojii mechara bịa kwuo na ọ bụ naanị mmadụ iri n’otu nwụrụ ebe ndị karịrị narị ise ka ha nwuchiri n’oge ngagharị iwe ahụ akpọrọ Saba Saba Protest.

Ozi mere ka amata na ọ bụ ụbọchị Monde gara aga mere afọ iri atọ na ise mba Kenya malitere nwenwa ọtụtụ otu ndọrọndọrọ ọchịchị nụdi multi party democracy.

Ọtụtụ ndị ka ahụrụ n’oge ngagharị iwe ka ha na akuri akọrọ ngwa ndị eji e nyere ndụ aka.

Onyeisi ala mba ahụ n’okwu ya n’oge mgbape otu ogige ndị uwe ojii ụnyaahụ bụ Wednesday mere ka amata na ọnọdụ ahụ ka ọchịchị ya agaghị anabata. Na ọ bụ ya kpatara ya ga ejiri usoro ọbụla buo agha were megide ndị ahụ afọ tara mmiri.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited