Otu ndorondoro ahu n’amasa ochichi mba Australia aka n’iru akporo Coalition of Liberals and Nationals edozighariala dika ndi ndu otu ndorondoro abuo a nwechara nkwekorita idiko n’otu.
Written by Onyinye on May 28, 2025
Otu ndorondoro ahu n’ amasa ochichi mba Australia aka n’ iru akporo Coalition of Liberals and Nationals edozighariala dika ndi ndu otu ndorondoro abuo a nwechara nkwekorita idiko n’ otu.
Nkwekorita a n’ abia dika ogatachara otu izu uka otu ndorondoro abuo a nwechara ogbaghara n’ etiti ha abuo.
Onye ndu otu ndorondoro Liberal bu Susan Ley kenere ogbo ya nke otu ndorondoro Nationals bu David Littleproud maka ezi nkwanye ugwu yanakwa usoro ka mma ojiri me ka otu ndorondoro abuo ahu dikwa n’ otu ozo.
Iga echeta n’ obu n’ ubochi Tuesday gara aga ka otu ndorondoro abuo a kowara dika ha nwechara nghotahie nke enweghi nkwekorita n’ otu atumatu iwu,kama na ha edoziela k’ odi ugbua.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.