Otu Nigerian Union of Journalist NUJ ngalaba ha nke Enugu state aṅụola iyi ịchịkoba ntụliaka ọchịchị nke eji nkwuba aka ọtọ were mee iji họpụta ndị isi ọhụrụ nke ya bụ otu.
Written by Onyinye on March 20, 2025
Otu Nigerian Union of journalist NUJ bụ otu jikọtara ndị nta akụkọ n’ala anyị ngalaba ya nke Enugu state ekwupụta njikere ha dị ihoputa ndị isi ọhụrụ ga anyara ụgbọ ọchịchị nke ya bụ otu gaa n’ihu.
Ha kwuru nkea dịka ha buchara ụkpa ekele bugara onyeisi oche nke ya bụ n’ala anyị bụ Comr Alhassan Yahaya maka ịnabata otu nchere oge akpọrọ caretaker committee nke Lady Agatha Agu nọ n’isi ya nyere otu NUJ Enugu state chapter.
Nkea pụtara ihe n’akwụkwọ ozi otu ahụ degaara onyeisi ha na izugbe ya n’ala anyị nke ọ bụ ndị isi ha yana odeakwụkwọ ha na Enugu state binyechara ya aka ha.
Ịga echeta na ọ bụ n’abalị asatọ nke ọnwa March n’afọ a ka anọrọ kpọlite Lady Agatha Agu dịka onyeisi oche nke nchere oge yana Comr Jude Chinedu dịka odeakwụkwọ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.