Otu nwa afọ ala anyị ji obodo Chicago nke dina mba United States mere isi ọnọdụ ekwuola na ọ ga amagbu onwe ya ma ọ bụrụ na onye pope ọhụrụ ga anochi anya pope Francis ga esite n’ala ndị isi ojii.
Written by Onyinye on April 24, 2025
Rev Fr Stan Chu Ilo bụ onye ụkọ Chukwu nke nzukọ nsọ Catholic ma bụrụkwa nnukwute onye nkụzi nọkwa nke Associates Professor na mahadum DePaul University dina obodo Chicago nke mba United States ekwuola sina onye ndu nke ụlọ ụka ọbụla kwesịrị isi n’ebe ụlọ ụka kacha nwee ndị nkwado ha were pụta.
O mere ka amata na ọ bụrụ na pope ọhụrụ na abịa ga esi n’ebe ụlọ nzukọ nsọ Catholic kacha eto kwa ụbọchị pụta na onye kwesịrị ịbụ nwa afọ ala ndị isi ojii.
Ndị otu Catholic n’ụwa niile ka o kwuru na ekee ha ụzọ abụọ na otu ụzọ sitere na mpaghara ala Africa.
N’agbanyeghị na enwela pope atọ sitere n’ala ndị isi ojii, onye nke ikpeazụ bụ pope Gelasius nke mbụ ka o kwuru na ọ nwụrụ ihe karịrị otu puku na narị afọ ise gara aga. Ebe ọtụtụ ga ekwu na ekwesịgo ịnwe onye ọzọ sitere n’ala Africa.
Rev Fr Ilo mechara jụọ ajụjụ ma oge ndị ahụ gbagotere na ndị ndu nke nzukọ nsọ Catholic bụ ndị akpọrọ cardinal electors ga ezuko n’obodo Vatican ihoputa Pope ọhụrụ, ma ihe ndị a o nwere ike ịbụ ebe mgbado anya nke ha ga eji họpụta pope ọhụrụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.