Otu nwaanyị ihe ejije n’otu Nollywood ajụola ajụjụ uru ụlọrụ JAMB bara kpatara ejiri hapụ ya ka ọ kana arụ ọrụ.
Written by Onyinye on May 17, 2025
Onye ihe nkiri onyonyo n’otu Nollywood bụ Mãry Njoku ajụola ajụjụ uru ụlọrụ n’ahụ maka ule eji aba mahadum bụ JAMB bara nyere agum akwụkwọ n’oge dị elu n’ala anyị.
Nwaanyị ahụ kwuru na ule nke ndị guchagoro n’ogo nke College akpọrọ SSCE ezuola mmadụ itozu oké maka ịba mahadum n’ala anyị.
Mary Njoku kọwara na ya amaghị ihe kpatara ejiri guzobe ule JAMB yana ogbo ya nke post utme ebe ule ssce egosila na nwata akwụkwọ dị etu ahụ aguchala n’ogo nke Secondary School.
Ihe banyere ule JAMB abụrụla nke mmadụ niile kpụ n’ọnụ n’ala anyị kworo maka etu ụmụ akwụkwọ sịrị daa na ule ahụ n’ụzọ dị egwu na nke afọ 2025 elechara na ọ dị nso a.
JAMB n’aka nke emechala pụta ìhè bịa rịọ mgbaghara sị na ọbụ ha ka o si n’aka. Ebe ụmụ akwụkwọ ndị ahụ ya bụ ihe metụtara ka ha ga akpọturu maka ụbọchị ha ga eleghari ya bụ ule.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.