Otu nwoke arigola elu ogige billboard ma kwuo na ya ga egbu onwe ya ma ọ bụrụ na ya ahụghị otu onye ama ama na ọwa ozi TikTok.

Written by on June 24, 2025

Ndị uwe Kano State police command azọpụtala otu nwoke gbara afọ iri na itoolu bụ Ibrahim Abubakar bụ nwa afọ Adamawa state n’oge ọ rigoro elu ogige billboard dị mpaghara Ado Bayero bridge ma kwuo na chọrọ igbu onwe ya.

Nwoke ahụ kwuru na ya ga-esi na ya bụ ebe matuo iji gbuo onwe ya ma ọ bụrụ na ya ahụghị otu onye ama ama na ọwa ozi TikTok akpọrọ Abdul BK.

N’otu akwụkwọ ozi onye binyere ya aka bụ DSP Hussaini Abdullahi ji ọkwa deputy police public relations officer mere ka amata na ọ bụ ozugbo ha nutara ozi banyere ọnọdụ ka ha mere ngwa ngwa gawa na ya bụ ogige hana ogbo ha nke fire service.

Ha mechara jiri arịrịọ ga kpọta onye ahụ o kwuru na ya ga ahụriri tupu Ibrahim Abubakar esi na ya bụ elu rituo.

Mana e buru ya gawa ụlọ ọgwụ ozugbo dịka ọ na-achọ ikubi kworo maka na ọ nọala ọtụtụ awa n’elu ahụ na erighi nri ọbụla.

Commissioner ndị uwe ojii na Kano State bụ CP Ibrahim Adamu Bakori mechara too ndị ọrụ ya maka iji amamihe soo ya bụ ọnọdụ ma dọọ ọhaneze aka ná ntị ka ha zere ọwụwa nke iji aka ha chọọ iwepụ ndụ ha kworo maka na nke ahụ bụ ịda n’iwu nke nwere ntaramahụhụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited