Otu onye nkụzi mahadum nke Benue State University dina Markudi bụ onye aka ndị ntori kpara na ọ dị nso a enwerela onwe ya.
Written by Onyinye on June 2, 2025
Otu onye nkụzi mahadum nke Benue state University dina Markudi bụ Dr Godwin Kwanga bụ onye aka ndị ntori kpara na ọ dị nso a enwerela onwe ya.
Dr Kwanga bụ onye nkụzi na ngalaba ihe ọmụmụ Geography ka a zọpụtara ụnyaahụ bụ Saturday site n’aka ndị uwe ojii akpọrọ operation Zenda yana ogbo ha nke joint task force tinyere ndị ọzọ donyere ha ukwu na Markudi bụ isi obodo Benue state.
A zọpụtara onye nkụzi ahụ kpọmkwem n’obodo Tse Anjov village nke didobere ebe akpọrọ Wafare Quarters bụkwa otu ebe ndị Fulani na-achị ehi ji mere ogige ili ozu n’okporo ụzọ mobile barracks ring road nke Markudi.
Anya hụrụ ka ihe siri mee gwara ndị nta akụkọ na ndị ntori ahụ mmadụ abụọ n’ime ha ji ọnyá nke mgbọ a gbara ha wara ọsọ ma banye n’ime ọhịa dịka ha niile gbahapuru onye nkụzi ahụ n’otu ebe yana ngwa ọgụ ha.
Ndị nta akụkọ nwetara ozi onye nkụzi ahụ ka e mechara jikọọ yana ezinụlọ ya n’abalị ụnyaahụ bụ Saturday n’oge ọ kụrụ elekere asatọ nke abalị na Markudi bụ isi obodo ha.
Mbọ niile ndị nta akụkọ gbara inuta ọnụ mmiri okwu Udeme Edet na e kwuru ndị uwe ojii ala anyị na Benue state amitaghi mkpụrụ ọbụla n’oge ha kpoturu ekwe ntị ya.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.