Otu onye ọka iwu na Rivers State akatola President Bola Ahmed Tinubu maka amụma ọchịchị gbata gbata akpọrọ state of emergency.
Written by Onyinye on May 17, 2025
Otu onye ọka iwu ama ama ma bụrụ nwa afọ Rivers State bu Bar Chetam Thierry Nwala akatola President Bola Ahmed Tinubu maka amụma ọchịchị gbata gbata akpọrọ state of emergency nke o kwupụtara nyere ọchịchị Rivers state.
Nwala kwuru na onyeisi ala nwere ihe o bu n’obi megide Rivers state kworo maka na akụnụba state ahụ amalitela ime nke ọma kemgbe ọtụtụ afọ ndị gara aga nke bụ na hana Lagos State na amazi aka n’ihu.
Dịka nwa amadi ahụ siri kọwaa, na onyeisi ala emela ka azụmahịa ghara ịbata na Rivers state ọzọ kemgbe ahụ nke naanị ụzọ ha sibu arachaa piom abụrụla nke e wezụgala.
Bar Nwala kwuru nkea taa bụ Friday n’oge o sonyere n’otu ihe omume were ọnọdụ n’otu igwe onyonyo n’isi ụtụtụ taa bụ oge o kwuru na amụma ahụ niile sitere esemokwu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị.
O mechara tụọ alo sị na naanị otu ụzọ aga esi weta ogbugbo nyere ọnọdụ ahụ bụ iweghachi ọchịchị onye kwuo uche ya azụ na Rivers state dịka ya bụ amụma state of emergency adabaghi na usoro iwu na-achị ala anyị.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.