Ọtụtụ ndị mmadụ karịrị otu puku agbakola n’obodo Ouagadougou bụ isi ọchịchị mba Burkina Faso iji kwupụta ndonye ukwu ha nyere ndị agha nke mba ahụ
Written by Onyinye on May 1, 2025
Ọtụtụ ndị mmadụ karịrị otu puku agbakola n’obodo Ouagadougou bụ isi ọchịchị mba Burkina Faso ụnyaahụ bụ Wednesday iji kwupụta ndonye ukwu ha nyere ndị agha nke mba ahụ dịka akụkọ kọrọ na ndị agha ọzọ kpara ububo ikwatu ọchịchị ndị agha akpọrọ military Junta nke President Ibrahim Traore nọ n’isi ya.
Na izu ụka gara aga ka ọchịchị ndị agha na mba ahụ kwuru na ha gbochiri ububo ọzọ ikwatu Captain Ibrahim Traore nọkwa ya dịka onyeisi ala bụ nke e kwuru na ndị kpara ububo ahụ zoro onwe ha na mba Ivory Coast bụ ndị hana ha nwere oke ala.
Otu nwa afọ mba United States ji ọkwa head of US military in Africa bụ Gen Michael Langley boro ebubo n’oge otu US Senate committee na enwe ọgbakọ ha sị na Capt Ibrahim Traore ji akụnụba mba ahụ nke jupụtara na ọla edo na eme ka ọ masịrị ya nke ọ bụ naanị ndị agha hana ya na-achị na erite elele na ya.
Imirikiti ndị nkịtị ahụ bụ agụkata agba awaa gbakọro n’otu ebe akpọrọ Place De la revolution dina Ouagadougou ụnyaahụ bụ Wednesday were na ekwere Captain Ibrahim Traore hallelujah na-asị ndụ ogologo oh Ibrahim Traore. Ọtụtụ n’ime ha jicha ederede placard nke na akato Gen Michael Langley nke mba United States ebe ndị ọzọ ji ọkọlọtọ mba Burkina Faso yana nke mba Russia na efegharị n’ikuku.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.