Pope Francis enwela nnupu isi na ntuzi aka ndi dibia oyibo na elekota aruike ya.
Written by Onyinye on April 14, 2025
Onye isi nzuko nso Christ na uwa niile bu Pope Francis anorola unya bu uka nupu isi na ntuzi aka ndi dibia oyibo ya nyere ya site na iga ma sonyere ndi uka na uka omu akporo Palm Sunday na ogige St Peter’s Square dina Basilica nke Vatican City na Rome.
Nke a bu dika yabu Pope Francis sonyere igwe mmadu na yabu aja Missa uka omu na agbanyeghi na ndi dibia oyibo ya nyere ya ndumodu ka ozeere ebe igwe mmadu noo dika okana agbake agbake na oya oyi bu Pneumonia onobu na ya.
Yabu nnukwu ukochukwu nke Rome di afo iri asato na asato ka ahutara dika ona emerube ubochi nyere igwe mmadu mana enyefe umuaka onyinye ihe nracha dika ona ekwe ndi mmadu na aka na okirikiri St Peter’s Square.
Ka osiladi, Pope Francis bu nwa afo mba Argentina ka ahutara ka obu na oche wheelchair ka ono na yabu ulo uka.
Ndi nta akuko wetara ozi na Pope Francis anorola ugboro ugboro bagide mmekorita yana igwe mmadu na agbanyeghi na ndi dibia oyibo na ayo ya ka ozuo ike nke oma.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.