President Bola Ahmed Tinubu a lọghachila azụ n’ala anyị ka o mechara njem ya gaa na mba France.

Written by on April 22, 2025

Onyeisi ala Nigeria bụ President Bola Ahmed Tinubu a lọghachila azụ n’ala anyị site na njem o mere gaa na mba France.

A nabatara onyeisi ala na ọdụ ụgbọelu nke Nnamdi Azikiwe International Airport dina Abuja n’oge ọ kụrụ elekere itoolu nke abalị ụnyaahụ site n’aka ụfọdụ ndị ọkwá ha gbagotere n’ọchịchị etiti ala anyị.

Ọnụ na e kwuru onyeisi ala bụ Bayo Onanuga eburula ụzọ nọrọ na ọwa ozi X were kwuo sị na ònyeisi ala ga a lọghachi azụ n’ala anyị ụnyaahụ bụ Monday.

Ọchịchị etiti kwuru na President Tinubu ga a lọghachi ngwa ngwa emerubechara mmemme Easter kworo maka mkpu ụmụ afọ Nigeria malitere tiwe banyere nkusu na ogbugbu a malitere igbu ndị mmadụ na Plateau yana Benue state ebe onyeisi ala ka nọ na mba ofesi ebe ọ gara ikuru ume ndụ.

President Tinubu hapụrụ obodo a gawa mba France kemgbe abalị abụọ nke ọnwa a bụ April n’agbazi egwu ụla.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited