President Donald Trump amachiela inye umu akwukwo inweta ikikere ibia guo akwukwo na mba America.
Written by Onyinye on May 28, 2025
Umu akwukwo mahadum achikobala ngaghari iwe iji akwado umu akwukwo ndi nke no na mba ofesi bu ndi nke ochichi President Donald Trump n’ achi mba America nyere ulo olu n’ ahu maka njem mba ofesi iwu ka ha kwusi inye akwukwo ikikere njem mba ofesi gara umu akwukwo dika ona akwadobe igbatikwu atumatu nke isite n’ usoro owa ozi me nnyocha gara ndi a tinyere akwukwo.
N’ akwukwo ozi ezigara nwa amadi ahu ji okwa Diplomatic Post Secretary nyere state ahu bu Marco Rubio, n’ akowa na iwu ga adigide ganye ha ha enwete ozi ozo sitere n’ aka ochichi mba America.
Ozi a gakwara n’ iru kowa,na nnyocha owa ozi a ga enye aka kwalitekwuo usoro umu akwukwo nakwa ndi ozo n’ abata mba ofesi si aga.
Iwu a n’ abia dika President Donald Trump ka gosichara ngbaru iru nyere ulo akwukwo nke obu nani ndi ezi n’ ulo ha wilitere isi na mba America n’ aga ma kowa ya dika ibuta nkewa n’ usoro nnabata umu akwukwo.
Ndi nta akuko nwetara ozi na ozi mmachi a enyere ulo olu US Embassies ka anoro gwa ha ka ha wepu ikikere njem nwata akwukwo obula bu nke ha edenyebeghi n’ akwukwo ma ga n’ iru n’ imetopu ndi nke ha ji n’ aka.
Ochichi President Donald Trump n’ achi inweta ego di nde dollar otu nari maka nkwado ulo akwukwo mahadum nke Harvard.
Umu akwukwo sitere mba ozo choro ibia guo akwukwo na mba America k’ ozi n’ akowa na aga ahaziri ha ule n’ ulo olu American embassy di n’ obodo ha tupu anabata ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.