President Donald Trump na achi mba United States awụchiela na Saudi Arabia bu ebe o ga anọrọ zute onyeisi ala mba Syria ọhụrụ.

Written by on May 15, 2025

Onyeisi ala mba United States nọrọ ụnyaahụ bụ Wednesday wuchie na mba Qatar bụ ebe ọ nọrọ zute ogbo ya na achị mba ahụ bụ Sheikh Tamim Al Thani. Nke ahụ were bụrụ njem na izu a bụ oge ọ ga anọrọ gaa mba atọ na mpaghara middle East.

Taa bụ Thursday ka Trump ga a wuchaa na mba Saudi Arabia bụkwa ebe ọ ga anọrọ zute onyeisi ala mba Syria ọhụrụ bụ Ahmad Al Sharaa.

Ya bụ nwa amadi ka e kwuru na ọ bụbu onye so n’otu isi ekwe ọnwụ akpọrọ insurgency bụ onye ụsụụ ndị agha nke mba US tuburu mkpọrọ na mba Iraq.

Donald Trump kwuru na ya kpebiri izute nwa amadi ahụ kworo maka mkparịta ụka yana ogbo ya ji ọkwa crown prince nke mba Saudi Arabia bu Mohammed Bin Salman yana onyeisi ala mba Turkey bụ Tayyip Erdogan nwere na ọ dị nso a.

Trump kwuru na ọ bụrụ na ububo ha nwee isi, na United States nwere ike ị wepụ mmachi ndị ahụ machiri mba Syria iji nyere ha aka ka udo lọghachi azụ na mba ahụ kworo maka na enwela ọchịchị ọhụrụ.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited