President Donald Trump nwekwara Ike okwuputa nkwekorita lbelata ego azum ahia nyere mba Canada nakwa Mexico.

Written by on March 5, 2025

Nwa amadi ahu ji okwa ode akwukwo azum ahia mba America bu Howard Lutnick emela ka amata na President Donald Trump nwekwara Ike okwuputa nkwekorita lbelata ego azum ahia ahu obugoro mba Mexico nakwa Canada tata bu Wednesday.

Onye ji okwa Minister of foreign affairs nyere mba Canada bu Melanie Joly no n’aka nke ya gwa ndi nta akuko na ulo olu ya enwetabeghi ozi obula banyere atumatu a.

Iga echeta na mba Canada nakwa Mexico noro n’odi nso a kwuputa otutu ego mbubata ngwa ahia nyere mba US dika isi ulo olu Washington ji percent iri abuo na ise bugo nke ha ebe mbugo mba abuo a nwere agbata obi malitere idi ire unya bu Tuesday.

Mazi Lutnick kowara hoha si na ya n’ atu anya mba US ibudata nke ha karikwa ikwusi ya kpamkpam.

K’osiladi, President Donald Trump noro n’oge ona ekwu okwu n’ogbako otu nzuko congress me ka amata na ya ka ga aga n’iru na abali abuo nke onwa April weputakwuo atumatu oga eji bugokwuo ego azum ahia gara mba ndi ahu nile n’akpaso mba US ajo agwa.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited