President Lula nke mba Brazil ekwela nkwa ihu n’ ewere ogbaghara ahu n’ ada n’ etiti mba Russia nakwa Ukraine n’ isi njedebe.
Written by Onyinye on May 14, 2025
Aka n’ achi mba Brazil bu President Luiz Ignacio Lula de Silva ekwela nkwa isogide ogbo ya nke mba Russia bu president Vladimir Putin ka oga nzuko ikpa ububo udo nyere aka n’ achi mba Ukraine bu president volodymyr zelensky na mba Turkiye tinyekwara ikppoku mba Moscow ka ha tinye onu n’ uzo ka mma aga eji weta ogbaghara ahu n’ ada kemgbe afor ato n’ isi njedebe.
President Lula n’ atu anya na ya ga akwusinata n’ isi Obodo mba Russia ma oburu na ya naghachitewe azu n’ ogbako regional forum ogara na china.
Onoro n’ ogbako achikobara ndi nta akuko na Beijing tata bu Wednesday tupu obanie njem ya maka nzuko onwere na mba china mee ka amata na ya ga agbariri mbo inwe nkparita ubobo nyere president Putin banyere nkea.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.