Prof. Jerry Gana, emela ka amata na nwa amadi ahu jiburu okwa governor Anambra state bu Mazi Peter Obi ga emeriri onye obula sitere ngbago ugwu imasa ya aka.

Written by on August 1, 2025

Nwa amadi ahu so na ndi choputara otu ndorondoro people’s democratic party PDP bu Prof, Jerry Gana, emela ka amata na nwa amadi ahu jiburu okwa governor Anambra state bu Mazi Peter Obi ga emeriri onye obula sitere ngbago ugwu imasa ya aka,ma oburu na ojiri okoloto otu ndorondoro PDP zoo okwa ochichi.

N’ okwu ya n’ ihe omume emere n’ otu ulo mgbasa ozi onyonyo unya bu Wednesday,ka Prof Gana noro kwuputa ihe ndia si na ya emela nnyocha banyere ihe ndi mmadu bu n’ obi .

Iga echeta na Mazi Peter Obi si n’ otu ndorondoro PDP puo n’ onwa May afo 2022 iji buru onye ndu otu ndorondoro Labour party n’ oge ntuliaka ochichi emere n’ afo 2023.

N’ oge ona elebara anya etu otu ndorondoro PDP Siri malite, ka onye ji okwa chieftain nke otu ndorondoro PDP chetara umu afo Nigeria etu mbo yabu otu ndorondoro gbagoro siri weghachite ochichi onye kwuo Uche ya n’ ala anyi a.

K’ osiladi,Prof Gana bu onye nke gbagoro otutu mbo n’ oge ana iwebata ochichi onye kwuo Uche ya, tinyekwara olu oluru dika minister of information and cooperation malite n’ afo 1999 ruo 2003, n’ oge ochichi former president obasanjo, rutukwara aka n’ oke nhatanha nyere otu ndorondoro di iche iche,dika okowara na oga erute ndi ngbago ugwu n’ afo 2031.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited