Senator Orji Uzor Kalu nke otu ndorondoro ochichi All Progressives Congress APC ekwuola na obu naani otu onye ka ha nwere ga a zoro ha okwa onyeisi ala Nigeria nke afo 2027
Written by Onyinye on March 5, 2025
Senator Orji Ụzọr Kalu nke otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress APC ekwuola ya ka ọ daa gem na ntị onye ọbụla na otu ndọrọndọrọ APC bụ naanị otu onye ka ha nwere ga a zọrọ ha ọkwa onyeisi ala Nigeria nke afọ 2027.
Senator Kalu bụ onye kwuru mkpa ọ dị na nwa afọ Igbo weghara ọkwa ọchịchị Nigeria dịka onyeisi ala kwuru na nke ahụ agaghị abụ n’afọ 2027. Dịka ọ kwụdosiri ike na President Bola Ahmed Tinubu ga-achịzuriri afọ asatọ zuru oke.
Ya bụ aka chiburu Abia State kwuru nkea ụnyaahụ bụ Monday n’igwe onyonyo Channels television n’oge ihe omume akpọrọ politics today. O kwuru na oge ahụ onyeisi ala ga achịzucha etu o kwesiri, na ụmụ Igbo ga e jikọ aka ọnụ wepụta otu onye ụmụ afọ ala anyị niile ga ejiri otu olu na otu obi were nabata.
N’okwu ya, ka Senator Orji Ụzọr Kalu mere ka o doo anya n’agbanyeghị na President Tinubu ekwubeghi na ya ga azọ ọkwa onyeisi ala nke ugboro abụọ ya, mana ha onwe ha dịka otu ndọrọndọrọ ọchịchị ekwupụtala ya na ọ ga agara ha ọzọ nọkwa nke onyeisi ala mgbe oge ruru.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.