Ulo ikpe nkpeghari bu Court of Appeal ji Abuja mere isi onodu enyela ochichi etiti ikikere ilebaghari anya na nkabi ikpe ahu machiri ulo olu EFCC ikpoliteghari ikpe ahu ana ekpe nwa amadi ahu jiburu okwa governor Abia state bu Sen Orji Uzor Kalu.

Written by on March 22, 2025

Ulo ikpe nkpeghari bu Court of Appeal ji Abuja mere isi onodu enyela ochichi etiti ikikere ilebaghari anya na nkabi ikpe ahu machiri ulo olu ahu n’ ebu agha emegide ima ego nakwa akuluba ohaneze mmiri ojo bu Economic and Financial Crimes Commission EFCC ikpoliteghari ikpe ahu ana ekpe nwa amadi ahu jiburu okwa governor Abia state bu Sen Orji Uzor Kalu.

Yabu ulo ikpe noro n’ otu panel ekewara uzo abuo nke ndi oka ikpe mmadu ato no n’ isi ya n’ otu n’ otu gbatikwuo oge nyere ochichi etiti igba akwukwo megide nkabi ikpe ahu ulo ikpe Federal High Court kabiri na abali iri abuo na itolu nke onwa September afor 2021 bu nke machiri ulo olu EFCC ikpupu Orji Uzor Kalu jiburu okwa governor Abia state ma noro ugbua dika senator na anochite ogbonta vote Abia north n’ ulo nzuko senate ulo ikpe.

Iga echeta na Kalu jiburu okwa governor Abia state malite n’ afor 1999 ruo 2007 ka ulo ikpe Lagos state high court noro na mbu ma ikpe ma tuo ya nga afo iri na abuo .

Nwa amadi a ka anwuchikoro yana ulo olu ya akporo slok Nigeria limited tinyekwara onye jiburu okwa Director of finance na state ahu bu Mazi Jones udeogu kwere maka ebubo na ha sitere na akpa ego state ahu ma ego di ijeri naira asaa na otu Uma mmiri ojo.

K’ osiladi, site n’ akwukwo ikpe nkpeghari mazi udeogu gbara ka ulo ikpe ekpocha ogwu bu supreme Court biaziri kagbuo ikpe amara ya ma zighachi akwukwo ikpe ya azu maka nkpeghari.

Na nkabi ikpe enwere ,bu nke gara maka odinmma Mazi udeogu, ka Kalu bu onye nke noburi n’ ulo nkporo, sitere n’ aka onye okaiwu ya bu Prof Awa Kalu SAN dee akwukwo ka esi n’ ulo nga kuje correctional center tohapu ya.

Ka ogatachara nwa ntakiri oge atohapuchara nwa amadi a,ka ulo olu EFCC malitere njem inwuchikwa yana onye otu ya ozo.

N’ enweghi afo ojuju banyere atumatu a,ka mazi orji Uzor Kalu tinyekwara ulo olu ya jiri gba akwukwo ozo n’ ulo ikpe imegide ikpe a ana akwadoro ha.

Kalu yoziri, na ihapu ulo olu EFCC ka ha kpugagharia ya ulo ikpe ozo n’ otu ikpe nke ejiburu tuo ya nga ga emekwa ya ita ahuhu ugboro na abuo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

Subscribe

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited