Ulo olu NDLEA anwuchiela nari kwuru nari ndi mmadu maka ogwu ike na Abia State.

Written by on June 26, 2025

Ulo olu ala anyi ahu na ebu agha emegide inu ma obu itu mgbere ogwu gunyere anwuru ike akporo National Drug Law Enforcement Agency NDLEA ejichiela ogwu ike ruru otu nde kilogrammes na uma iri iteolu na ano na Abia State na ime otu afo.

Yabu olu NDLEA gakwara na iru nwuchiko mmadu di nari abuo, iri abuo na abuo ana enyoenyo na aka ha dina oba ekere ede megide habu ogwu ike.

Nke a putara ihe unya bu Wednesday na Umuahia bu isi obodo State ahu na okwu ogwara ndi nta akuko bu onye jigodu okwa Commander nyere ulo olu NDLEA na Abia State bu mazi Chigbu Odoemelam Chilee banyere mmeme ubochi mba uwa weputara maka ibu agha megide mmeto ogwu nke afo a akporo 2025 United Nations Day Against Drug Abuse.

Mazi Chilee kowara na ulo olu ya na aga na iru itinye ihe niile na usoro nke oma igbochi inu nakwa izu ahia ogwu ike na State ahu.

Na oge ona akowa na obu naani na mpaghara Aba ka enwere ogige ntiteghari na udi Rehabilitation Centre maka ndi ogwu ike na State ahu ka yabu onye Acting Commander ulo olu NDLEA kowara na Gov Alex Otti keputara usoro iruputa ogige Rehabilitation Centre ozo na Umuahia.

Mazi Chigbu Odoemelam Chilee kwuputara na Gov Otti nyefere ulo olu ya onyinye ugboala olu.

Okowara na ogwu ike ndi ahu ejichiri ejichi na Abia State na ime yabu otu afo gunyere: Cannabis, nke Sativa, cocaine, methamphetamine amakariri dika mkpurummiri, ogwu ojo heroin, codeine nakwa otutu ndi ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited