Ulo omebe iwu nke Lagos State akatola iga mposi aghara aghara

Written by on February 12, 2025

Dịka anọrọla n’ime abalị ole na ole gara aga merube mmemme ụbọchị ebe mposi akpọrọ World toilet day n’ụwa niile nke isiokwu ya na bekee sịrị, Toilet, a place for peace, akpọla oku nyere mkpa ọ dị ịhụ na ụmụ afọ ala anyị mere ebe mposi ha ka ọ bụrụ ebe dị ọcha oge niile.

Ụlọ nzukọ ndị omebe iwu nke state Lagos nọrọ n’aka nke ha kpọkuo ụlọrụ ministry n’ahụ maka gburugburu ebe obibi yana mmiri ọṅụṅụ na state ahụ ka ha tinye n’ọrụ bụ iwu gburugburu ebe obibi ahụ na ebu agha e megide ịga mposi aghara aghara akpọrọ open defecation ma guzobe ogige mposi ọhaneze na mpaghara niile nke state ahụ.

Ndị omebe ahụ bụ ndị kwuru okwu iche iche kpọrọ oku ka a gbasaa ozi ahụ iji gwa ndị mmadụ ọghọm na ihe ize ndụ dị na ịga mposi aghara aghara. Ha kwuru na ọ bụ nke na e butere ahụike ndị mmadụ okoro ma na ebute ajọ ọnọdụ akụnụba.

Otu nwa amadi wepụtara ọkpụkpọ oku ahụ dịka ozi dị oke mkpa bụ Hon Stephen Ogundipe na anọchite anya ọgbọ nta vote Oshodi Isolo 1 state constituency kwuru na ịga mposi aghara aghara bụ nke na emebi ezi aha ejiri mara state Lagos ma na-egbochi mmepe tọrọ atọ nyere state ahụ.

Ọ gara n’ihu kọwaa na ya bụ ajọ ọnọdụ sokwa n’ihe ize ndụ nyere ahụike ma kpọọ oku na aga amariri ihe e mere iji kpọbata ndị ọnụ na-eru n’okwu ga abịa kwado ezi ọnọdụ ahụike nke ụmụ ibe.

N’aka nke ya ka onye omebe iwu na anochite anya ọgbọ nta vote Badagry 1 bụ Hon Bonu Sọlọmọn kpọrọ oku ka amalite ịnwụchi ndị arịrịọ nọ n’okporo ụzọ bụ ndị o kwuru na ha na ebute ihe ọdachi nyere gburugburu ebe obibi. Ma rịọ ọchịchị council ime obodo ka ha donyere ogbo ha nke state ukwu n’agha ana ebu iji mee ka gburugburu doro ahụ bụrụ nke dịgidere.

Onye ọzọ kwuru okwu n’oge ọgbakọ ndị omebe iwu bụ Hon Arọ Moshood na anochite anya ọgbọ nta vote Ikorodu 2 bụ onye kwuru na ọtụtụ akụkụ osimiri e nwere na state ahụ aghọọla ogige ebe mposi nyere ndị bi na gburugburu ahụ.

Ọ gbakwunyere na ndị na-azụ ahịa yana ndị nlekọta nke ahịa mile 12 anaghị enyere gọọmenti aka n’udi ọbụla banyere ọnọdụ ahụ.

Na nchịkọta ya ka ọnụ na e kwuru ụlọ omebe iwu Lagos State House of Assembly bụ Rt Hon Princess Mojisola Meranda katọrọ ya bụ agwa nke enweghị otu ogige ebe mposi ma kọwaa mkpa ọ dị ịhụ na edoziri okwu ọbụla metụtara inwe ogige ebe mposi a rụrụ n’ụzọ ọgbara ọhụrụ.

O nyekwara ndị mmadụ ndụmọdụ ịchekwaba ogige ebe mposi ha ma mee ya ka ọ dị ọcha maka ahụike nke onye ọzọ ga abata mgbe ị gachara mposi nke gị.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies