Ụlọ ọrụ NDLEA anwuchiela mmadụ atọ bu ndi ji ọgba tumtum ekesa ọgwụ ike na Abuja bu ịsị obodo Nigeria.
Written by Onyinye on August 4, 2025
Ụlọ ọrụ National Drug Law Enforcement Agency NDLEA anwuchiela mmadụ atọ bu ndi na eji ọgba tumtum ezigara ndị mmadụ ihe ha zụrụ nke amakariri dịka dispatch riders kwere maka na ha na eji ọgba tumtum ha na ekesa ọgwụ ike na Federal Capital Territory FCT Abuja bu ịsị obodo Nigeria.
Nkea putara ihe site n’ọnụ na ekwuchitere ụlọ ọrụ NDLEA bu Femi Babafemi, ụnya bu Sunday na Abuja.
Babafemi kọwara na ndị NDLEA mere nyocha miri emi na mpaghara Gwarimpa, Jahi nakwa Galadimawa dịcha na FCT n’ụbọchi Wednesday abalị iri atọ n’ọnwa July afọ a bu 2025.
O nyere aha ndị ahụ ana enyo enyo anwụchiri dika, Sabo Sule dị afọ iri abuo na anọ, Samuel Nnamdi dị afọ iri abuo na asatọ nakwa Idris Jibrin dị afọ iri abuo na asatọ, na agbakwụnye na enwetara ọgwụ ike dị otu narị na iri anọ na itoolu na ụma asatọ n’ọnụ ọgụ yabu 149.8 grams n’aka ha.
Mmadụ abụọ ọzọ gụnyere, Aliyu Abubakar dị afọ iri abuo na ise nakwa Adekunle Agbabiaka dị afọ iri atọ, bu ndi anwụchiri na ogologo ụzọ Abaji-Gwagwalada expressway dika a hụtara ọgwụ ike dị iri itoolu na otu na ụma otu n’ọnụ ọgụ yabu 91.1kg n’aka ha n’ụbọchi Saturday abalị abụọ n’ọnwa August afọ a anyi nọ n’ime ya.
Babafemi gara n’iru mee ka amata na ndị NDLEA na Lagos State nwuchiri otu nwoke enyere aha ya dika Joseph Michael n’ụbọchi Saturday na Mushin ebe enwetara ọgwụ ike dị atọ na ụma atọ n’ọnụ ọgụ yabu 3.3 kilograms n’aka ya, tinyekwara ọtụtụ ebe ndi ọzọ dị iche iche.
Ọ gakwara n’iru mee ka amata na ndị NDLEA na agbasi mbo ike iji nwuchikọ ma kpochapu ndị nile na agba mgbere ma na ekesa ọgwụ ike na ala anyi gba gburugburu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.