Ụlọrụ n’ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ WHO ekwupụtala ọnwụ otu nwatakịrị gbara afọ anọ dịka onye nke abụọ nwụrụ na ọrịa Ebola

Written by on March 4, 2025

Ụlọrụ n’ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ WHO ekwupụtala ọnwụ otu nwatakịrị gbara afọ anọ dịka onye nke abụọ nwụrụ na ọrịa Ebola bụ nke tasuru ọzọ na mba Uganda kemgbe ọnwa January n’afọ a.

N’ụbọchị Tuesday nke izu gara aga ka ụlọrụ ahụike na mba Uganda kwuru na ha enwetala mkpesa banyere mmadụ iri butere ọrịa ahụ bụ nke yiri udiri ahụ n’akpa ike na mba Sudan.

Ọnwụ nke nwatakịrị ahụ emela ka ndị ọrụ ahụike daa mbà bụ ndị chere na ọnọdụ ahụ ebelatala ozugbo mmadụ asatọ nwetachara onwe ha ma gbakee na ọrịa ahụ.

Nwata ahụ nwụrụ n’ụbọchị Saturday n’ụlọ ọgwụ Mulago Hospital dị na isi obodo mba Uganda bụ Kinshasa bụ ebe e kwuru na ọ bụ naanị ebe ahụ ka ana agwọ ọrịa Ebola na mba ahụ niile.

Onye nke mbụ buru ụzọ nwụọ bụ onye ọrụ ahụike nurse bụ onye nwụrụ n’abalị iri atọ nke ọnwa January tupu achọpụta na ọrịa ahụ abịala ọzọ.

Ụfọdụ ihe ndị na-apụta ihe n’ahụ onye bu ọrịa ahụ gụnyere oyi nke ịma jijiji, oke isi ọwụwa, ahụ mgbu yana ịgba ọbara. Ya bụ nje ka ana ebute site na imetụ ahụ gị na maa mmiri, ọbara ma ọ bụ asọ mmiri nke onye bu ya.

Ka ọ dị ugbu a, otu WHO enyela mba Uganda akatamkpo ego nde dollar atọ iji gbatara ha ọsọ enyemaka chụọ ya bụ ọrịa na-adị achọwa ikpochapụ agbụrụ ọ dakwasịrị.

Na mgbe ọrịa Ebola tasuru n’ọnwa Septemba nke 2022 na mba Uganda ka ọ nọrọ taa isi mmadụ iri ise na ise. Ebe ihe o gbugoro egbu n’ala ndị isi ojii gbaa gburugburu kemgbe afọ iri ise gara aga akariela puku iri na ise.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited