OBUGHIKWA MWAKPO K’ ANYI MEGARA OGIGE ISI ULO OLU OTU SERAP – DSS

Written by on September 10, 2024

Ndi nchekwa oje na mmuo Department of State Services DSS enyela nkwuwa okwu ha megide ebubo otu Socio Economic Rights and Accountability Project SERAP boro sina ha noro unya bu Monday wakpo ogige isi ulo olu otu a dina Abuja.

Iga echeta etu SERAP siri noro unya bu Monday tie mkpu n’ oke olu sina ndi nchekwa oje na mmuo DSS wakporo ogige isi ulo olu ya dina Abuja n’ uzo megidere iwu.

Nke a dotara nkwuwa okwu nke nkato sitere n’ onu otutu ndi mmadu nakwa otu di ichiche n’ azo maka ikikere ohaneze.

SERAP nokwara yabu unya bu Monday kpokuo President Bola Ahmed Tinubu k’ ome ngwangwa nye ndi DSS ntuzi aka ka ha kwusi ebubo ha boro sina ndi nchekwa oje na mmuo a na amaja, emegide mana akusukwa yabu otu nona isi ugbo izo maka ikikere diara ohaneze umu afo Nigeria n’ akuluba ala anyi.

Ka osiladi, n’ ozi DSS weputara n’ owa ozi mmekorita ohaneze ya taata bu Tuesday ka ndi nchekwa oje na mmuo ala anyi a noro kowa n’ obu naani njem oma nnyocha kwa oge nile nyere ogige di ichiche ka ndi olu ya mmadu abuo n’ enweghikwa ka ha siri jiri ngwa agha megara na ogige isi ulo olu otu SERAP unya na Abuja.

DSS noro n’ oge ona akowa ezi usoro iwu ha gbasoro na njem a kato etu esiri buo ozi nduhe uzo megide yabu njem nnyocha naani mmadu abuo n’ ejighi egbe ma obu ngwa ogu n’ udi obuna megara ogige isi ulo olu otu SERAP.

Ndi nchekwa oje na mmuo ala anyi a yoziri ohaneze ndi Nigeria ka ha gharakwa ige nti na yabu ozi ebughariri megide ha, dika ha yokwuru maka ntinye oke umu afo obodo a n’ ihe banyere ezi nchekwa ala anyi.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies