President Donald Trump na-achị mba United States emechala n’ikpeazụ binye aka n’akwụkwọ nke gbochiri enyemaka niile si na mba ahụ na agara mba South Africa.

Written by on February 10, 2025

President Donald Trump na-achị mba United States emechala n’ikpeazụ binye aka n’akwụkwọ nke gbochiri enyemaka niile si na mba ahụ na agara mba South Africa. Nke a bụ kworo ebubo ha boro si na mba South Africa amalitela ịnapụ ụmụ afọ obodo ha ọkachasi ndị ọcha oke na ugwu ruru ha n’ebe o metụtara ịnwe ala ịkọ ubi nke aka ha.

N’ụbọchị Friday nke ngwụcha izu ụka anyị pụrụ n’ime ya ka Donald Trump nọrọ binye aka na ya bụ akwụkwọ iwu akpọrọ executive order.

Mana mba South Africa nọrọ n’aka nke ha katọọ agwa ahụ ma kwuo na President Trump ajughi ase nke ọma banyere ihe na-eme n’obodo ha ịmata nke bụ eziokwu.

Ihe ndị ọzọ Trump kwuru na ọ na ewute ya gụnyere etu mba South Africa soro ogbo ha ndị ọzọ na ebo mba Israel ebubo ikpochapụ agbụrụ n’oge agha ahụ dara hana mba Palestine.

Otu nwa amadi bụ onye ndụmọdụ kacha nọrọ Donald Trump nso bụ Elon Musk bụ onye a mụrụ na mba South Africa esonyerela ogbo ya ndị ọzọ na ajụ ihe kpatara onyeisi ala mba South Africa bụ Cyril Ramaphosa ga-eji wepụta udiri iwu ahụ n’obodo ya.

President Ramaphosa n’aka ya enwebeghi ihe o kwuru n’ime ndị a niile naanị na ọ nọrọ n’ụbọchị ụka gara aga mgbe ogbo ya bụ Trump nọchara yie egwu ịkwụsi enyemaka ọbụla na agara ha, were kwuo sị na mba South Africa enwebeghi onye ọ napụrụ ala ya, kama na iwu ahụ gbadoro ụkwụ na iwebata oke nhatanha n’ebe o metụtara ịnwe ala na mba ahụ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies