Onye ọ bụ abụ oziọma bụ Paul Nwokocha yana nwunye ya nke abụọ ọ lụrụ na ọ dị nso a agbala alụkwaghịm.

Written by on February 11, 2025

Alụmdi na nwunye dị n’etiti onye ọ bụ abụ oziọma bụ Paul Nwokocha yana nwunye ya nke abụọ bụ Mrs Goodness Nwokocha akụrụla ọnụ.

Ndị nta akụkọ nwetara ozi Paul yana Goodness lụrụ onwe n’ọnwa Septemba nke afọ 2023 gara aga.

Onye ọgụ egwu ahụ anọrọla na mbụ buo nwunye ya nke mbụ bụ Mrs Alice Nwokocha ebubo ị dina eme ya ka awatara ya na nkụ bụ nke mere ka ha mechaa gbasaa. Ozugbo ahụ ka Paul lụrụ Goodness bụ onye sitere n’obodo Nkpa nke council ime obodo Bende nke dị na Abia steeti.

Otu onye ezinụlọ nwa amadi ahụ gwara ndị nta akụkọ na esemokwu malitere n’ọnwa May nke afọ 2024 ka ebochara ebubo na Paul malitere kpasowa nwunye ahụ ajọ agwa.

Ya bụ ozi kọwara na Goodness enweghị ka o siri mata onye Paul Nwokocha bụ nke ọma tupu ha alụọ onwe ha. Naanị na o sitere na Lagos state ebe obi were lọta bịa lụwa Paul Nwokocha site na ntụziaka nke nwanne nna ya.

Ka ọ dị ugbu a, ya bụ ezinụlọ nke nwaanyị eweghachitela Paul ego o mere n’isi nwunye ahụ iji gosi na church agbasago n’ebe o metụtara alụmdi na nwunye ha.

Na nzaghachi ya nyere ọnọdụ ndị a niile ka Paul Nwokocha dere na ọwa ozi ya were sị n’otu ihe ya nwere megide nwunye ya nke abụọ ahụ bụ na ọ na ezigara ụmụ nwoke ndị yana ya na-eme oyi eserese yana ihe onyonyo video ebe ọgba ọtọ.

Paul mechara tie aka n’obi ya sị, na ọ bụrụgodị ya lụọ nwaanyị ọzọ taa ma chọpụta na nwaanyị ahụ na-ebi ndụ rụrụ arụ n’ihu Chukwu na mmadụ, na ya ga-achụpu ya ozugbo n’agbanyeghị awa ole yana ya biri dịka di na nwunye.

Ọ gwara ndị ahụ kpụ ya n’ọnụ na ọwa ozi ka ha kwụsị ịkpọ ya aha, n’ihi na ihe ya chọrọ ịlụ bụ nwaanyị na-atụ egwu Chineke na ọ bụghị akwụna.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies