Akpụpula nwa afọ mba Afghanistan n’ụlọ ikpe dina mba Germany maka ebubo igbu ọchụ yana ụbụbọ igbu mmadụ ibe ya.
Written by admin on February 14, 2025
Otu nwa afọ mba Afghanistan ana atụ anya na ọ bụ onye okpukperechi ụka Islam abụrụla onye anọrọ ụnyaahụ bụ Thursday kpụpụ n’ụlọ ikpe dị na mba Germany maka na o gburu mmadụ ibe ya ma chọọkwa igbu onye ọzọ n’otu ogige ebe ana eme ọgbakọ ndọrọndọrọ ọchịchị na mpaghara ndịda anyanwụ obodo Mannheim.
Ikpe nke nwoke a na-abịa mgbe mba Germany ị tinye ọnụ n’okwu metụtara ịnabata ụmụ afọ obodo ọzọ na mba ha tinyere ọnọdụ nchekwa nke mba Germany dịka ha ga anọrọ n’abalị iri abụọ na atọ nke ọnwa Febrụwarị were chịkọba ntụliaka izugbe na mba ahụ.
Nwoke ahụ ana ebo ebubo bụ Sulaiman A ka e kwuru na ọ ji mma merụọ mmadụ isii ahụ nke gụnyere otu onye uwe ojii gbara afọ iri abụọ na itoolu bụ onye mechara were nwụọ na nke ya. Nkea mere n’oge ngagharị iwe akpọrọ anti Islam demonstrations ha mere na ngwụcha ọnwa May nke afọ 2024.
Sulaiman ka ahụrụ ka o ji ihe dịka akwa kpuchie ihu ya n’oge a kpụpụrụ ya n’ụlọ ikpe higher regional court dina obodo Stuggart bụ isi ọchịchị nke Baden Wuerttemberg.