Ndi Uwe Ojii Na Ebonyi State Enyela Nkowa Na Ebubo Mwakpo Ndi Osochi Egbu Wakporo Obodo Dina State Ahu

Written by on June 9, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi uwe ojii ala anyi na Ebonyi State akowala ya dika ozi awarawa na abughi eziokwu na udi obuna bu ozi onyonyo na efeghari na owa ozi mmekorita ohaneze sina ndi osochi egbu bandits nakwa ndi agburu Fulani na achu efi wakporo obodo Nguzu Edda dina Edda LGA nke State ahu.

Na ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Tuesday na ogige Police Command’s Headquarters dina Abakaliki ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State ahu bu SP Joshua Ukandu mere ka amata na yabu ozi onyonyo bu asi ma buru ozi nduhe uzo.

SP Ukandu kowara na ndi uwe ojii awuchigo yabu obodo Nguzu Edda ma huta na onweghi ihe obuna dika ndi ekperima na mpaghara ahu.

Okowara na obu Commissioner habu ndi uwe ojii na Ebonyi State bu CP Hope Urunwa Okafor nyere iwu ngwangwa enwetara yabu ozi onyonyo ka onye Divisional Police Officer DPO na elekota Edda Police Division wuchie ma mee nnyocha na onodu a, ebe ozigara ndi uwe ojii tactical team sitere isi ulo olu ha na Abakaliki iga noro na yabu obodo.

SP Ukandu yoziri ndi obodo Nguzu Edda nakwa ohaneze ka ha gharakwa ige nti na yabu ozi onyonyo okowara dika nke sitere na aka ndi udo na asa afo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited