Kim Sae Ron ama ama na ihe nkiri onyonyo nke mba South Korea anwuola
Written by admin on February 17, 2025
Otu nwaanyị onye ihe nkiri onyonyo na mba South Korea bụ Kim Sae Ron abụrụla onye ahụrụ ka ọ tọgbọrọ n’ozu na be ya ụnyaahụ bụ ụka dịka ndị uwe ojii na mba ahụ siri kwupụta.
Kim bu onye gbara afọ iri abụọ na anọ tupu oge ọnwụ ya bụ onye kacha ewu ewu n’ihe gbasara ịmepụta ihe nkiri onyonyo na mba South Korea mana egwu daghariri n’ebe ọ nọ ozugbo o nwechara ihe mberede okporo ụzọ n’afọ 2022 kworo maka mmanya ọ ṅụrụ na anya ụgbọala.
A chọpụtara ozu ya n’oge enyi ya gara ileta nwaanyị ahụ na be ya mana ọ hụrụ ya ka ọ tọgbọrọ n’ozu bụ onye mere ngwa ngwa were kpọọ ndị uwe ojii.
Ndị uwe ojii kwuru na ha atụghi anya na o nwere ihe aghụghọ dị na ọnwụ nke onye ihe nkiri onyonyo ahụ mana ha Kaga eme nyochaa banyere ọnwụ ya.