Onyeisi ala mba South Africa bụ President Cyril Ramaphosa etuola ndị okpukperechi ụka Islam na mba ahụ dịka ha malitere Ramadaan.
Written by Onyinye on March 3, 2025
President Cyril Ramaphosa na-achị mba South Africa a goola ọfọ ọma n’isi ndị okpukperechi ụka Islam dịka ha malitegoro ọnwa ha ji eme ekpere na ebum ọnụ ha akpọrọ Ramadaan.
Na ụwa niile nke ndị ụka alakuba na amalite na mgbe chi bọrọ buwa ọnụ ma na-emekwa ekpere so ya ruo mgbe chi ga eji n’ime oge a anyị nọ n’ime ya.
President Ramaphosa kwupụtara njikere ọchịchị ya dị ịnye otu okpukperechi ọbụla oke nhatanha ma kpọọ oku ka akwụsị agha na ọgba aghara na-ada na mpaghara ụwa ndị ọzọ ọ kachasị nke metụtara okpukperechi onye si na ya.