Mba Israel akwụsịla nri na ọrụ enyemaka ọbụla na-abanye n’obodo Gaza.
Written by Onyinye on March 4, 2025
Mba Israel amalitela ịkwụsị kpamkpam ọrụ enyemaka ọbụla na abanye n’obodo Gaza n’ihe ha kwuru sị na nkwekọrịta udo itinye mma n’obo nke hana otu isi ekwe ọnwụ Hamas nọrọ na mbụ kpaa abịala n’isi njedebe.
Prime minister mba Israel bụ Benjamin Netanyahu bụ ya kwuru na otu Hamas jụrụ ịnabata mgbatị ụbọchị udo ahụ dịka onyeisi ala mba United States bụ Donald Trump sịrị nye ntụziaka.
Otu nwa amadi nochitere anya otú Hamas nọrọ n’aka nke ya na-akpọ oku ka amanye mba Israel ka ọ hapụ ọrụ enyemaka nke gụnyere ihe oriri ana e wetara ụmụ afọ obodo Gaza.
Ha bụ otu sitere Hamas sitere na mba Palestine na-ekwu na mba Israel ga eburiri ụzọ kpọpụtacha ndị agha ha na mpaghara ahụ ma tọhapụkwa ndị nga nke mba Palestine niile ha ji eji n’ụlọ mkpọrọ tupu a gaa n’ihu na ụbụbọ udo ọhụrụ.
Ịgbatị oge nkwekọrịta a mba United States na arịọ bụ nke ga ewere ọnọdụ n’ime ịzụ ụka isii bụ oge ndị okpukperechi ụka Islam ga-eji merube ekpere na ebum nke Ramadaan ebe mba Israel n’aka nke ha ga-eme emume nke oriri ngabiga amara dịka passover.