Spyro nke na-akụ egwu awantilo ebuola ebubo si na ndị na-abụ abụ Ozioma pụtara n’ọgbọ ịkpata ego dịka ogbo ha na akụ egwu afrobeat.
Written by Onyinye on April 22, 2025
Ọkụ egwu afrobeat ama ama n’ala anyị bụ Oludipe Oluwasanmi David onye ana etu Spyro ebuola ebubo sị n’ọtụtụ ndị ọbụ abụ Ozioma bịara ịkụ egwu naanị isi na ya kpata ego.
O kwuru na o nweghị ihe dị iche na egbe na egbe n’ebe o metụtara ndị ahụ na abụrụ Chineke abụ Ozioma yana ogbo ha na-akụ egwu awantilo.
Ya bụ nwa amadi na-akpọkwa onwe ya Jesus Boy kwuru nkea n’oge ndị nta akụkọ na amịrị ya okwu n’ọnụ n’otu igwe onyonyo bụ ebe ọ nọrọ kwuo ya hoo haa na ọ bụ ego ka ha niile na-achụ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.