Atụọla aka chiburu mba Mauritania mkpọrọ afọ iri na ise maka arụ ndị ọ kpara oge ọ nọ n’ọchịchị.
Written by Onyinye on May 15, 2025
Ụlọikpe court of Appeal nọ na mba Mauritania atụọla aka chiburu mba ahụ bụ Mohamed Ould Abdel Aziz mkpọrọ afọ iri na ise yana nra ego dị nde dollar atọ maka arụ ndị e kwuru na ọ kpara n’oge ọ nọ n’ọchịchị mba ahụ dịka onyeisi ala.
Mohamed Abdel Aziz ka e kwuru na ọ bụbu ọchịagha nọkwa General ma bụrụ onye bịara n’ọchịchị site n’aka ike nke akpọrọ military coup d’etat ugboro abụọ tupu o mechara chịa mba ahụ dịka onyeisi ala n’agbata afọ 2009 ruo n’afọ 2019.
Ya bụ ụlọikpe mkpeghari kwuru na ikpe mara ya na ebubo i bukọrọ ego ọhaneze nke dị nde dollar iri asaa $70 million nụdi ahụ nwa bekee kpọrọ money laundering yana ịba ọgaranya nerughi eru.
Mohamed Abdel Aziz anọrọla n’ụlọ mkpọrọ kemgbe afọ 2023 eburu ụzọ maa ya ikpe.
Ya bụ nkabi ikpe anọrọla ugbua dịka ihe ịma atụ nyere ala ndị isi ojii gbaa gburugburu dịka nke a bụ onyeisi ala mbụ ana atụ nga maka arụ ndị ọ kpara oge ọ nọ n’ọchịchị. Mana nkwado ya kana ekwu na ọ bụ okwu metụtara ndọrọndọrọ ọchịchị ka ejiri emegide nwa amadi ahụ.
Mba Mauritania n’agbanyeghị ubara akụ Chinyere dị n’ime ala nke chi jiri chọọ ha mma abụrụla obodo dara ogbenye nke agụụ na ụbịam n’echi ụmụ afọ ha ọnụ n’ala.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.