Mba Morocco anọrọla kemgbe ọtụtụ afọ ndị gara aga rue ugbua na azọ onwe ha azọ na ọrịa arụbara akpọrọ measles.

Written by on May 15, 2025

Kemgbe ọtụtụ afọ ndị gara aga, ọrịa arụbara bụ measles abụrụla nke nọ n’akpa ike dị egwu na mba Morocco nke ihe karịrị otu puku mmadụ abụrụla ndị butere ya na mba ahụ.

Malite na ngwụcha afọ 2023, ihe ruru puku mmadụ iri abụọ na ise abụrụla ndị ana atụ anya na ha butere ya bụ nje ebe otu narị na mmadụ iri asatọ na anọ anwụọla n’ime ha.

Ya bụ nje nke tasuru na mpaghara Souss Massa region nke mba ahụ emechala gbasaa gazuo na mpaghara region niile e nwere na mba ahụ.

Ebe ụmụaka na erubeghị afọ iri na asatọ bụ ndị ya ọrịa kacha ebi aka ọjọọ.

Iji belata ya bụ ọrịa ụlọrụ n’ahụ maka ahụike na mba Morocco agbapela amụma nke ịgba onye ọbụla ọgwụ mgbochi ọ kachasị ụmụaka ebe a gwakwara ndị okenye ka ha sonyere na ya.

Ka ọ dị ugbu a, ụmụaka kariri nde iri abụrụla ndị agbara ya bụ ọgwụ site na enyemaka nke ụlọ akwụkwọ, ụlọ ụka yana ndị ndu obodo.

N’agbanyeghị na ya ihe mechara belata, ya bụ ọrịa bịara tasuo ọzọ ọ kachasị n’oké ala mba ahụ hana mba ndị ọzọ. Ụlọrụ n’ahụ maka ahụike na mba ụwa bụ World health organisations ekwuola na ụmụ afọ Morocco ime njem aghara aghara n’ime oge a nwere ike mee ka njem ahụ fesaa ka ọkụ uguru na mpaghara Afirka niile.

Ndị ọchịchị na mba ahụ agwala ndị nne na nna ka onye ọ bụla gbaa ụmụ ya ọgwụ mgbochi arụbara ma dere duu dịka agha ana ebu emegide ọrịa ahụ kana aga n’ihu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited