Ndi ana enyo na ha bu ndi oji egbe agbagbuola mmadu abuo ndi gunyere otu onye okaiwu na Anambra State.

Written by on May 17, 2025

Ndi ana enyo na ha bu ndi oji egbe agbagbuola mmadu abuo ndi gunyere otu onye okaiwu bu onye nke ruburu olu dika president general nke ime Obodo Aguleri na Anambra East LGA nke Anambra state.

Odachi mere n’ ebe Obodo Agulu na Nanka nwere okere ala na Anaocha LGA dika hapu ndi ekperima ji ogba tum tum awughari n’ ogige ahu.

Commissioner ndi uwe oji ala anyi na Anambra state bu CP Ikioye Orutugu dulu ndiwelitere isi n’ olu uwe oji tinyekwara deputy commissioner ndi uwe oji n’ elekota ndi olu, ga n’ ogige ebe odachi a mere n’ ime Obodo Egbebelu,dina Nanka na orumba North LGA.

N’ okwu ya ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Anambra state bu SP Tochukwu Ikenga bu onye kwuputara maka odachi a mere ka amata, na yabu onye okaiwu ahu egburu anorogo na mbu napu onye ana ebo obubo maka ogbugbu ya n’ aka ebe banyere ogbugbu mmadu n’ ikpe ka n’ aga n’ iru n’ ulo ikpe High court 2 Dina Ekwuluobia.

Omekwara ka amata na otu onye n’ ime ndi danyere n’ onya ha nwetara ihe mmeru aru ma n’ anara ogwugwo n’ ulo ogwu ,ebe ezi n’ ulo ndi nke nwugoro anwu choputagoro ma buru ozu ndi nke ha.

Commissioner ndi uwe oji enyego ntuziaka ka eme nnyocha toro ato ma nwuchie ndi a kpatara ajo agwa dika okwere nka ihu n’ enwere ikpe nkwu m oto.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited