Ndi Agha Ala Anyi Akpala Ike Di Egwu Megide Ndi Isi Ekwe Onwu Na Akpa Ike Ojo Na Mpaghara Di Ichiche Na Nigeria.

Written by on April 14, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi agha ala anyi nke elu ala Nigerian Army akpala ike di egwu ma buru ike oma site na inaputa mmadu iri na otu na aka ndi oluo otunye isi nakwa ndi ekperima toro ha na mpaghara di ichiche nke ala anyi a.

Habu ndi agha mere ka amata na nke a sitere na nnukwute agha ha malitere ibu kemgbe otu ubochi ka odi ugbu a megide habu ndi isi ekwe onwu na mpaghara di ichiche na ala anyi.

Na ozi ha nyefere ndi nta akuko taata bu Tuesday site na owa ozi mmekorita ohaneze ka Nigerian Army kowara na obu ngalaba ha nke Army Theatres digasi na ala anyi a buru habu agha megide ndi ala adighi mma ahu.

Ndi agha a kowara na ha biri aka ojo gaara ndi osochi egbu ahu ma tisa atumatu agha nkusu ha choro imegasi.

Nigerian Army kwuputara na ha nwuchikoro onye enyemaka ndi isi ekwe onwu Islamic State of West African Province ISWAP na mpaghara Ngamdu dina Borno State nke mgbago ugwu North East ebe onye ahu aka kpatara megoro ka amata na ona adonyere habu ndi nkusu ukwu na ike ojo ha na mpaghara Gubio nakwa Magumeri nke State ahu.

Ebe ndị ozo habu ndi agha ala anyi buru agha megide ndi isi ekwe onwu ma naputakwa ndi danyere na onya ojo ha gunyere: Bauchi, Yobe, Katsina, Zamfara, Plateau, FCT Abuja, nakwa Edo State.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited