Mba China Akatola Mba America Maka Imechisi Odommiri Mba Iran.
Written by admin on April 14, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Mba China akatola mba United States of America maka igbochi odommiri enwegasiri na mba Iran dika osiri di na agha ahu na ada kemgbe na etiti habu mba abuo nakwa mba Israel.
Nke a putara ihe taata bu Tuesday site na ozi oweputara na owa ozi mmekorita ohaneze bu onye isi ala mba China bu President Xi Jinping.
President Xi Jinping kowara nke a dika odachi ma buru ihe na adighi mma sitere na aka mba America.
Onuru iyi igba mbo kwesiri ekwesi maka nkwalite udo na mpaghara Middle East.
Iga echetazi na onye isi ala mba America bu President Donald Trump anorola kemgbe abali putara unya bu Monday kwuputa mmachi ya megide odommiri niile enwere na mba Iran kwere maka enweghi nkwekorita na ubobo udo anoro na ngwucha izu uka gara aga kpa na etiti habu mba abuo.
President Trump yikwara egwu imikpu ugbommiri banyere ma obukwanu choo isite na odommiri obuna enwere na mba Iran puo gunyekwara ikpere mmiri ndi ozo dina mpaghara Gulf region.
Ndi nta akuko wetara ozi na obu kemgbe abali iri abuo na asato nke onwa April afo a bu 2026 ka mba America nakwa Israel jikoro aka malite ibu agha megide mba Iran ma buru nke butegoro onodu amaghi kwuru na mpaghara Middle East ruo taata.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.