Otu nwaanyị n’akụ egwu awantilo n’ala anyị akọwala ihe kpatara ya jiri kwụsị ịga ụka.
Written by Onyinye on May 26, 2025
Nwa afọ ala anyị na-akụ egwu bụ Seyi Shay akụwala akụ oyibo nsugbe were kwuo ihe kpatara ya jiri kwụsị ịga ụka.
O kwuru na ya mere mkpebi ahụ ozugbo ndị ndu nke ụlọ ụka ya kwuru ka kwụsị ịgụ egwu ọgbara ọhụrụ eji eto Chineke ma lọghachi azụ na ukwe ndị ahụ dina akwụkwọ nsọ ha na agụbu mgbe gboo.
Seyi Shay kwuru na nke ahụ wutere ya n’ebe ọ dị elu kworo maka na ukwe ahụ bụ ndị agbára na ohu gụrụ ya mgbe ha na-ata ahụhụ ma mechaa nyefee ya n’aka nna nna anyị oche ha bụ ndị mbụ malitere okpukperechi ụka otu Kristi.
Nwaanyị ahụ nyere ndị otu Kristi ndụmọdụ ka ha tụlee ukwe ọbụla ha ekwe nke ọma tupu ha agụwa ya kworo maka na iberibe abụghị ya bụ odudo nsọ.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.