Ndị omebe iwu na mba Suriname aghọpụtala Jennifer Geerlings-Simons dika nwanyi mbu ga abụ onye isi ala na mba ahụ.
Written by Onyinye on July 7, 2025
Ndị omebe iwu ghọpụtara Jennifer Geerlings-Simons dika nwanyi mbu ga a bu onye isi ala na mba Suriname ụnya bu Sunday, dika otu ndọrọndọrọ ya nwetara nturu ugo na ntule aka ọchịchị emere n’ọnwa May.
Yabu nwanyi dị afọ iri asaa na otu bu nanị onye ahapụrụ yabu oche onye isi ala dika onye ya na ya zọrọ ọkwa ọchịchị ahụ kpebiri n’ụbọchị Thursday gara aga na ya agaghi aghọputa onye ọbula ka ọburu onye ndu yabu mba Suriname dị na South America’s northern coast.
Geerlings-Simons nke otu ndọrọndọrọ National Democratic Party NDP, nwetara nturu ugo n’oche iri na asatọ n’ime oche iri ise na otu, karịa ndị nke otu ndọrọndọrọ VHP party bu otu ndọrọndọrọ nke President Chan Santokhi bu onye nke na apụ apụ.
Yabu otu ndọrọndọrọ NDP nakwa otu ndọrọndọrọ ise ndị ọzọ nwere ezi nkwekọrịta bu nke jikọrọ aka ọnụ nweta ntutu ugo oche iri atọ na anọ.
Nwa amadi chọpụtara yabụ otu ndọrọndọrọ NDP bu onye jibu ọkwa onye ndu ndi uweojii ma bụrụ onye aghọputara dika onye isi ala enyere aha ya dika Formal president Desi Bouterse, bu onye lakwuru chi ya n’ọnwa December afọ 2024.
Otu ndọrọndọrọ Santokhi bu ndi nwere okwukwe iguzobe coalition iji nọgide n’ọchịchị, mana ha mere nkwuputa na ha kpebiri na ha agaghị ama aka megide ntuli aka Geerlings-Simons.
Mba Suriname bu mba ndi mejupụtara ya sitere na mba India, Indonesia, China, Netherlands, Otu ụmụ amaala yabu Indigenous groups nakwa ndị ohu sitere mba Africa yabu African slaves, ga emerube mmemme afọ iri ise dika mba nnwere onwe ha site na oche eze Dutch n’ọnwa November afọ a anyi nọ n’ime ya.
N’ime afọ ndị na-adịbeghị anya, ha lekwasịrị mba China anya dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị nakwa onye mmekọ azụmahịa ha, mana afọ 2019, ha ghọrọ otu n’ime mba Latin America mbụ sonyere ndị Asia giant’s Belt nakwa okporo ụzọ akụrụngwa.
Mba Suriname nke bubu ogbe Dutch bu nke narị puku mmadụ isii bi na ya, bukwanu otu n’ime mba ndị kasị daa ogbenye na ndịda America, na-atụ anya na mmụba mmanụ ga-ewetara ha ọganihu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.