Ndị uweojii na Delta State emela ka amata na ha nwuchiri otu nwoke gbara afọ iri abuo na asaa kwere maka ebubo na ogburu enyị ya nwayi.
Written by Onyinye on July 21, 2025
Ndị uweojii na Delta State emela ka amata na ha nwuchiri otu nwoke gbara afọ iri abụọ na asaa enyere aha ya dika Kelvin Obakpororo, kwere maka ebubo na ogburu enyị ya nwayi ma burukwa onye mụrụ ya ụmụaka abụọ enyedebere aha ya dika Excellence.
Nkea putara ihe ụnya bu Sunday site n’aka onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii na State ahụ bu SP Bright Edafe, na Asaba bu ịsị obodo State ahụ.
Ịga eheta na agbata abalị iri abụọ na ịsịị ya na abalị iri abụọ na asaa nke ọnwa June, na onwere ozi na efeghari n’ụwa ozi gbasara otu nwoke gburu enyi ya nwayi na Sapele, na mbu yabụ nwa amadi riri mbombo ọsọ mana aka mechara kpata ya dịka ọ nọzi n’aka ndị uweojii k’ọdị ugbua.
N’oge ana agba ya ajụjụ ọnụ, nwa amadi a ana enyo enyo bu Obakpororo kwupụtara na ọ bu ọgwụ ike ọnwụrụ bu ihe kpaliri ya ojiri gbuo nwanyi ahụ.
Ọ gara n’iru kọwaa na mgbe ọbula nwanyi ahụ bịara na bee ya, na ọ ga agbanwe akwa ya gawa na bee nwoke ozo, n’ụbọchi ahụ ihe ọdachi a mere, na yabu nwanyi bịara na bee ya mana ha na abụọ malitere ngwarita ọnụ, nwanyi ahụ wetara nma yabu nke nwoke weta hammer dika oji ya kụọ ya n’isi ugboro atọ tupu ọ da n’ala nwụọ.
Obakpororo mekwara kwupụta na ya na egwu wayo n’ụwa ozi bukwanu nke amakariri dịka pressing.
SP Bright Edafe kwere ọhaneze nakwa ha ga akpụpụ nwa amadi a n’ụlọ ikpe ngwa ngwa ha mechara nyocha ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.