Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State anwuchiela otu nwoke ana enyo maka itu mgbere mmadu site na mba ga na mba.
Written by Onyinye on August 15, 2025
Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State abawanyela ume olu ha n’ agha ha n’ ebu emegide itu mgbere mmadu site n’ inwuchi otu nwoke gbara afo iri ato ana enyo enyo na ona atu mgbere mmadu site na mba ga na mba n’ udi nwa bekee kporo (Transnational trafficking) ma buru onye nke enyere aha ya dika Raymond Sunday wonna, ma naputa obere umu agbohobia kana eto eto mmadu abuo bu ndi danyere n’ ajo onya ya, enyere aha ha dika miracle ogar gbara afo iri na asato, nakwa Angela Kingsley gbara afo iri na isii , bucha umu afo yala LGA nke Cross River state.
Nkea putara ihe site n’ ozi onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Enugu State bu SP Daniel Ndukwa nyefere ndi nta akuko unya bu Wednesday.
SP Ndukwa mere ka amata na obu n’ abali iri ato nke onwa July afo a anyi no n’ ime ya, n’ ihe dika elekere abuo nke ehihie,ka ndi olu ha akporo Crack Tactical squad noro n’ oge olu nnyocha n’ okporo uzo ha sitere Enugu gawa onitsha nwuchie onye a ana enyo enyo.
Okowara na nnyocha mbuzo ha mere n’ egosi na nwa amadi ahu aka kpatara n’ adi bia kporo obere umu agbohobia n’ udi ichotara ha olu n’ emeghi ka ndi Nne na Nna ha na obukwanu ndi metutara ha mara, gawa mba Ghana bu ebe oji ha atu mgbere.
Anokwara na nnyocha ndi ozo emere choputa na yabu nwoke ajo obi chokwara ima habu obere umu nwanyi enu n’ Ike n’ ebe odebere ha n’ ulo oriri na onunu ganya n’ oruo oge ha ga apu gawa mba Ghana.
Omeziri ka amata na habu ndi uwe oji mechara naputa ma nyefe umu nwanyi ahu n’ aka ndi ezi n’ ulo ha, ma kana agbakwa mbo ichoputa ndi otu ha ndi ozo.
Yapu onye PPRO na Enugu State mere ka amata na commissioner ndi uwe oji ala anyi na Enugu State bu CP Mamman Bitrus Giwa psc kenere ndi olu uwe oji ahu maka ezi mbo ha gbara ma nyekwa ha iwu ihu na ha mere nnyocha nke oma banyere agwa ekperima ma mecha n’ oge tupu akpuga nwoke ahu ulo ikpe.
Okpokuziri ohaneze ka ha muru anya na nchekwa oge nile ma wetara ndi uwe oji ozi banyere ije agwa obula ha hutara na gburu gburu ha,ma obukwanu ha akpo akara ekwe nti ndia 08932003702 , 08086671202, ma obukwanu akara 122.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.