Onye Jitopuru Okwa Onye Isi Oche Otu Ndorondoro PDP Enwetala Okwa Onye Isi Oche APC Na Enugu State
Written by admin on March 4, 2026
by Treasure Moses
Nwa amadi ahu jitopuru okwa onye isi oche otu ndorondoro People’s Democratic Party PDP na Enugu State bu Dr Martins Chukwunweike eturula ugo dika onye isi oche ohuru otu ndorondoro All Progressives Congress APC na State a.
Nke a putara ihe na ubochi Tuesday na ogbako nroputa akporo Elective Congress otu ndorondoro APC were onodu na isi obodo Enugu ma buru ebe anoro roputa mmadu iri ato na isii ndi ozo dika ndi sona otu nchikwa APC na ogogo State a.
Ufodu na ime ndi ozo ahu aroputrara hana Dr Martins Chukwunweike dika ndi nchikwa otu ndorondoro APC na Enugu State na ogbako a were onodu na ogige Okpara Square nke isi obodo Enugu gunyere: Odoziaku Peace Patrick Nnaji dika Deputy First Chairman, Hon Nnamdi Nwafor dika Vice Chairman maka ogbonta vote Enugu East Senatorial District, Hon Fabian Onah na okwa Vice Chairman maka ogbonta vote Enugu North, Hon Nze Chimaobi David eturu ugo na okwa Vice Chairman maka Enugu West, dika Hon Chukwudi Nnaedozie nwetara okwa Secretary ebe Hon Chidi Okoh turu ugo na okwa Assistant Secretary.
Ndi ozo gunyere: Barr Lovina Eneh dika Legal Adviser, Hon Patrick Okoh na okwa Treasurer, Engr Ejike Iteodo enweta okwa Financial Secretary, Engr Onyinye Odibe dika Organizing Secretary, Hon Uche Obute dika Publicity Secretary, Barr Ifeanyi Ogenyi na okwa Welfare Secretary, Odoziaku Esther Edeh dika Woman Leader nakwa otutu ndi ozo.
Na okwu ya ka onye ndu otu ndorondoro APC na Enugu State ma burukwa aka na achi State a bu Gov Peter Ndubuisi Mbah buru ukpo ekene bugara ndi ahu turu ugo gunyekwara ohaneze ndi otu ndorondoro a ma kowa otutu elele Enugu State nwetagoro kemgbe osonyere otu ndorondoro APC bukwanu ndi gunyere: nnyefe odu ugboelu Akanu Ibiam International Airport and Cargo Terminal na udi akporo Concession, igbatikwu olu okporo ugbooloko ka orute State a, atumatu itinyere State a okporo ikuku mmuo High-Pressure Gas Pipeline nakwa otutu elele ndi ozo.
Na okwu nnabata nturu ugo ya ka onye isi oche otu ndorondoro APC a aroputara ohuru bu Dr Martins Chukwunweike kwere nkwa umeala nakwa ihuna APC nwetara mmeri na ntule aka ochichi ndi dina iru na State a.
Na mbu na okwu ya ka onye isi oche ochichi nchere oge na apu apu nyere APC na State a bu Dr Ben Nwoye toro Gov Peter Mbah maka iwebata udo na ezi mgbanwe ka mma na otu ndorondoro a.
Ndi ozo sonyere ma kowa ezi nkwuba aka oto ogbako a gunyere: onye National Deputy Chairman APC maka mpaghara ndida ugwu ala anyi bu Chief Emma Enukwu, onu na ekwuru ulo nzuko omebe iwu State a bu Rt Hon Uchenna Ugwu, dika osote aka na achi State a bu Barr Ifeanyi Ossai nakwa ode akwukwo govt Enugu bu Prof Chidiebere Onyia gunyere otutu ndi ozo wuchiri ogbako a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.