Mba Israel Egbuola Ochi Agha Izugbe Mba Iran

Written by on March 17, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Mba Israel emela ka amata na onapugo ochi agha izugbe mba Iran na okwa Iranian National Security Chief bu Ali Larijani ndu ya na ike.

Mba Israel kowara na ogakwara na iru gbuo onye ochi agha oyiri ndi agha paramilitary yabu mba mejuputara na ndi okpukpere uka Islam bu oyiri ndi agha amara dika Basij paramilitary force.

Ihe ndi a putara ihe taata bu Tuesday site na onu Minister mba Israel na ahu maka ndi agha bu mazi Israel Katz na okwu ogwara ndi nta akuko site na igwe mgbasa ozi onyonyo banyere agha ahu Israel jikoro aka yana mba America ebu na mba Iran.

Mazi Israel Katz kowara na obu agha mba Israel buru na abali putara taata bu Tuesday ka ndi agha Israeli Defence Forces IDF noro gbuo yabu onye ochi agha izugbe mba Iran nakwa ogbo ya ochi agha nke oyiri ndi agha Basij paramilitary force.

Ozi kowaziri na ogbugbu yabu onye ochi agha izugbe bu Ali Larijani ga abu onye nke abuo kachasi gbagote na mba Iran egbugoro na agha a kemgbe abali iri abuo na asato nke onwa February gara aga omalitere ma elegara anya na ogbugbu nke eburu uzo gbuo onye ndu ejecha ogwu na okwa Supreme Leader yabu Iran bu Ayatollah Ali Khamenei.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited