Mba Iran Emela Nkusu Aghara Aghara Megide Mba Qatar, United Arab Emirates Nakwa Saudi Arabia.
Written by admin on March 19, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Mba Iran akusuola ogige mmanu na ikikere oku energy sites enwegasiri na mba Qatar, United Arab Emirates nakwa Saudi Arabia dika osiri di na agha ahu na ada na mpaghara Middle East kwere maka ibu agha mba United States of America nakwa Israel jikoro aka ebuso yabu mba Iran.
Na nkusu a Iran megara ka mba Qatar nyere iwu ka ndi agha niile sitere Iran nona mba ahu puo ozugbo.
Nke a bu dika yabu nkusu eji ngwa ogu Missiles mee biri aka ojo na ogige ikuku mmuo gas facility dina mpaghara Ras Laffan yabu mba Qatar.
Na aka nke ya ka mba Saudi Arabia mere ka amata na mba Iran wakporo ogige nsichaputa mmanu abuo dina mba ahu.
Riyadh bu isi obodo yabu Saudi Arabia kwuputaziri na onweghizikwa ntukwasa obi ozo nyere Iran kwere maka nkusu a ndi agha Iranian military buru banye ogige nsichaputa mmanu abuo mba ahu.
Mba United Arab Emirates nokwara na otu aka ahu mee ka amata na omechigo ogige ikuku mmuo Habshan gas facilities mba ahu kwere maka nkusu a mba Iran megara ya.
Onodu a nakwa uzo agaghi aga na owara ikpere mmiri ebe nbufere mmanu na ogogo mba uwa amara dika Straits of Hormuz ka ozi ndi nta akuko nwetara mere ka amata na ogala na iru na iwetekwu ajo onodu nkawanye njo nke odachi mmanu petrol, ikuku mmuo gas nakwa ikikere oku electric na mba uwa di ichiche.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.