Nwa Afo Igbo Na Delta State Choputara Ulo Oba Ego Zenith Bank Abanyela Ezum Ike Nka Na Olu Yabu Ulo Oba Ego

Written by on May 5, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo oba ego Zenith Bank Plc ekwuputala ina ezum ike nka nwa amadi ahu choputara ma burukwa onye isi oche yabu ulo oba ego bu Jim Ovia kwere maka ogwugwu oge ochichi ya dika osiri di na usoro na achikwa oba ego.

Nke a putara ihe taata bu Tuesday na ozi yabu ulo oba ego weputara ndi nta akuko na Lagos State.

Na ozi a ka Zenith Bank Plc mere ka amata na obu usoro iwu Corporate Governance Guidelines nke Financial Holding Companies gaara ulo oba ego ka Jim Ovia gbasoro ana ezum ike nka.

Zenith Bank kowakwara na nwa amadi a anogo afo iri na abuo na ochichi dika onye isi izugbe ma burukwa onye nwe yabu ulo oba ego.

Ozi mere ka amata na Jim Ovia bu nwa afo Igbo sitere Agbor dina Ika South LGA nke Delta State, ebe amuru ya na abali ano nke onwa November afo 1951.

Ovia noziri na afo 1990 choputa ulo oba ego Zenith Bank Plc ma buru ulo oba ego sona nke kachasi eme nke oma na obodo a bu Nigeria nakwa ala isi oji Africa niile.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited