Ulo Ikpe Mba UK Akachapula Ikpe Mpu Na Aru Ana Ekpe Diezani Alison-Madueke

Written by on June 18, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo ikpe mba United Kingdom akabiela ikpe ma kwuputa nwaanyi ahu jiburu okwa Minister ala anyi huru maka mmanu petrol bu Odoziaku Diezani Alison-Madueke dika onye aka ya di ocha na ebubo di isii nke gbadochara ukwu na iri aka azu nakwa igba izu ekperima bukwanu nke ejiri noro kemgbe akpughari ya na ulo ikpe.

Yabu ulo ikpe Southwark Crown Court dina London bu isi obodo mba ahu kabiri ikpe a dika ojicha ihe kariri elekere iri ano na isii yabu; over 46 hours lebara anya na ebe odi ukwuu na ikpe nwaanyi a jiri okwa Minister na oge ochichi Former President Goodluck Jonathan.

Ozi kowara na mba Britain kpugara nwaanyi a ulo ikpe na ebubo ise banyere ina aka azu nakwa otu ebubo mere ha isii banyere igba izu ekperima ojiri naa aka azu oge ahu oji okwa minister ala anyi huru maka mmanu petrol na agbata afo 2010 ruo 2015.

Aka azu a ka eboro ebubo na Odoziaku Diezani Alison-Madueke nara site na olu ngo ulo olu Ministry ya oge ahu oji okwa ochichi, mana onoro kemgbe ikpe ya malitere kwudosie ike igo kpamkpam megide ebubo ndi a.

Ozi meziri ka amata na nkabi ikpe a unya bu Wednesday kwuputara mmadu abuo ozo eboro hana nwaanyi a ebubo dika ndi aka ha di ocha, ebe yabu nkabi ikpe wetara ya na isi njedebe bu ikpe a notegoro otutu afo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited