Otutu Umuakwukwo Mahadum Atoola Na Odida Ulo Ebe Obibi Ha Dina Anamabra State

Written by on July 27, 2026

by Maduabuchi Onwe

Ihe mberede ulo odida mere na ebe obibi umu akwukwo amara dika Elite Five Star Lodge nke dina Amokpala Oko na Orumba North local government area nke Anambra state atochiela otutu ndi mmadu, ebe ana atu anya na ndi ozo nwere ike ibu ndi nwuru anwu na yabu odachi mere na obodo ahu arunyere ulo akwuwkwo mahadum Federal Polytechnic, Oko.

Yabu ihe mberede ulo odida mkpokwu ato mere na isi ututu taata bu Monday, abali iri abuo na asaa nke onwa July afo a bu 2026 ka ulo olu na ahu maka onodu gbata gbata na state ahu mere ka amata na ha ka na eme nnyocha ichoputa ndi meruru aru nakwa ndi nwuru na ya.

Nke a putara ihe site na onu ndi uwe ojii ala anyi na Anambra state na ozi ha nyefere ndi nta akuko na Awka bu isi obodo state ahu na isi ututu taata, dika ha mere ka amata na anaputago ufodu ndi mmadu na yabu ihe mberede ulo odida.

Na ikpeazu ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na state ahu bu SP Tochukwu Ikenga meziri ka amata na ha ebugago ufodu ndi meruru aru na yabu ihe mberede na ulo ogwu ebe ha noo wee na anara ogwugwo, dika ha kana eme nnyocha imata mmadu ole yabu mmiri fiara na eze na state ahu.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited